Jeremaya 1:9
Jeremiah 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
Jeremiah 1:9 in English
Jeremiah 1:9 · Berean Standard Bible
Then the LORD reached out His hand, touched my mouth, and said to me: “Behold, I have put My words in your mouth.
Context
7Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu. 8Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ. 10Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.” 11Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?”
Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.