Jeremaya 1:7
Jeremiah 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.
Jeremiah 1:7 in English
Jeremiah 1:7 · Berean Standard Bible
But the LORD told me: “Do not say, ‘I am only a child.’ For to everyone I send you, you must go, and all that I command you, you must speak.
Context
5“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị,
tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ,
ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.” 6Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.” 7Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu. 8Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.