Jeremaya 1:17
Jeremiah 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.
Jeremiah 1:17 in English
Jeremiah 1:17 · Berean Standard Bible
Get yourself ready.* Stand up and tell them everything that I command you. Do not be intimidated by them, or I will terrify you before them.
Context
15Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha
nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem,
imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu,
na imegidekwa obodo niile nke Juda. 16Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha,
nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ,
na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ,
nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ. 17“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha. 18Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ. 19Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.