Jeremaya 1:16
Jeremiah 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.
Jeremiah 1:16 in English
Jeremiah 1:16 · Berean Standard Bible
I will pronounce My judgments against them for all their wickedness, because they have forsaken Me to burn incense to other gods and to worship the works of their own hands.
Context
14Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a. 15Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha
nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem,
imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu,
na imegidekwa obodo niile nke Juda. 16Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha,
nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ,
na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ,
nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ. 17“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha. 18Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.