Jeremaya 1:15
Jeremiah 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda.
Jeremiah 1:15 in English
Jeremiah 1:15 · Berean Standard Bible
For I am about to summon all the clans and kingdoms of the north,” declares the LORD. “Their kings will come and set up their thrones at the entrance of the gates of Jerusalem. They will attack all her surrounding walls and all the other cities of Judah.
Context
13Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?”
A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.” 14Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a. 15Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha
nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem,
imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu,
na imegidekwa obodo niile nke Juda. 16Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha,
nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ,
na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ,
nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ. 17“Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.