Jeremaya 1:13
Jeremiah 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”
Jeremiah 1:13 in English
Jeremiah 1:13 · Berean Standard Bible
Again the word of the LORD came to me, asking, “What do you see?” “I see a boiling pot,” I replied, “and it is tilting toward us from the north.”
Context
11Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?”
Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.” 13Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?”
A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.” 14Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a. 15Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha
nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem,
imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu,
na imegidekwa obodo niile nke Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.