Ndị Ikpe 5:6
Judges 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
Judges 5:6 in English
Judges 5:6 · Berean Standard Bible
In the days of Shamgar son of Anath, in the days of Jael, the highways were deserted and the travelers took the byways.
Context
4“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta,
mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga,*
ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu
sikwa na mbara eluigwe zodata. 5E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị.
Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 6“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat,
nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị,
ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga. 7Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel,
tutu ruo mgbe m bịara,
ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel. 8Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe,
mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile,
ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe.*
E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.