Ndị Ikpe 5:4
Judges 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga,* ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.
Judges 5:4 in English
Judges 5:4 · Berean Standard Bible
O LORD, when You went out from Seir, when You marched from the land of Edom, the earth trembled, the heavens poured out rain, and the clouds poured down water.
Context
2“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel,
mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha,
toonu Onyenwe anyị! 3“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi!
Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ.
Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. 4“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta,
mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga,*
ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu
sikwa na mbara eluigwe zodata. 5E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị.
Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 6“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat,
nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị,
ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.