Ndị Ikpe 16:24
Judges 16:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”
Judges 16:24 in English
Judges 16:24 · Berean Standard Bible
And when the people saw him, they praised their god, saying: “Our god has delivered into our hands our enemy who destroyed our land and multiplied our dead.”
Context
22Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ. 23Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn,* aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.” 24Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị,
“Chi anyị enyela onye iro anyị
nʼaka anyị,
onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu
gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.” 25Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu.
Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị. 26Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.