Ndị Ikpe 16:22
Judges 16:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.
Judges 16:22 in English
Judges 16:22 · Berean Standard Bible
However, the hair of his head began to grow back after it had been shaved.
Context
20O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.”
Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya. 21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya. 22Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ. 23Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn,* aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.” 24Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị,
“Chi anyị enyela onye iro anyị
nʼaka anyị,
onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu
gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.