Native Bible

Judges 16:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”

Judges 16:26 in English

Judges 16:26 · Berean Standard Bible

Samson said to the servant who held his hand, “Lead me where I can feel the pillars supporting the temple, so I can lean against them.”

Context

24Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.” 25Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị. 26Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.” 27Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị. 28Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.