Aịzaya 8:6
Isaiah 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa* nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
Isaiah 8:6 in English
Isaiah 8:6 · Berean Standard Bible
“Because this people has rejected the gently flowing waters of Shiloah and rejoiced in Rezin and the son of Remaliah,
Context
4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 5Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị, 6“Nʼihi na ndị a ajụla
mmiri Shiloa* nke ji nwayọọ na-asọ
ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin
na nwa nwoke Remalaya, 7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta
iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha,
bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile.
Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile,
ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile, 8wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile,
ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru.
Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị,
O Ịmanụel.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.