Aịzaya 8:5
Isaiah 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
Isaiah 8:5 in English
Isaiah 8:5 · Berean Standard Bible
And the LORD spoke to me further:
Context
3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz. 4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 5Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị, 6“Nʼihi na ndị a ajụla
mmiri Shiloa* nke ji nwayọọ na-asọ
ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin
na nwa nwoke Remalaya, 7ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta
iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha,
bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile.
Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile,
ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.