Aịzaya 8:4
Isaiah 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”
Isaiah 8:4 in English
Isaiah 8:4 · Berean Standard Bible
For before the boy knows how to cry ‘Father’ or ‘Mother,’ the wealth of Damascus and the plunder of Samaria will be carried off by the king of Assyria.”
Context
2Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.” 3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz. 4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 5Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị, 6“Nʼihi na ndị a ajụla
mmiri Shiloa* nke ji nwayọọ na-asọ
ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin
na nwa nwoke Remalaya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.