Aịzaya 63:5
Isaiah 63:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
Isaiah 63:5 in English
Isaiah 63:5 · Berean Standard Bible
I looked, but there was no one to help; I was appalled that no one assisted. So My arm brought Me salvation, and My own wrath upheld Me.
Context
3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya;
o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka.
Azọchara m ha nʼiwe m,
zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m;
ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m,
ma metọsịa uwe m niile. 4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ;
afọ mgbapụta m kwadoro eruola. 5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka.
O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka.
Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri.
Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya. 6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche;
esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha.
Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.” 7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị.
Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere.
Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ,
e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel,
nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.