Native Bible

Isaiah 63:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.

Isaiah 63:3 in English

Isaiah 63:3 · Berean Standard Bible

“I have trodden the winepress alone, and no one from the nations was with Me. I trampled them in My anger and trod them down in My fury; their blood spattered My garments, and all My clothes were stained.

Context

1Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa, onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara? Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma, onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume,* onye dị ike ịzọpụta!” 2Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị? 3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile. 4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola. 5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.