Aịzaya 63:4
Isaiah 63:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
Isaiah 63:4 in English
Isaiah 63:4 · Berean Standard Bible
For the day of vengeance was in My heart, and the year of My redemption had come.
Context
2Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara,
dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị? 3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya;
o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka.
Azọchara m ha nʼiwe m,
zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m;
ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m,
ma metọsịa uwe m niile. 4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ;
afọ mgbapụta m kwadoro eruola. 5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka.
O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka.
Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri.
Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya. 6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche;
esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha.
Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.