Aịzaya 63:6
Isaiah 63:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
Isaiah 63:6 in English
Isaiah 63:6 · Berean Standard Bible
I trampled the nations in My anger; in My wrath I made them drunk and poured out their blood on the ground.”
Context
4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ;
afọ mgbapụta m kwadoro eruola. 5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka.
O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka.
Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri.
Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya. 6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche;
esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha.
Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.” 7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị.
Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere.
Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ,
e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel,
nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị. 8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m;
e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.”
Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.