Aịzaya 55:11
Isaiah 55:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
Isaiah 55:11 in English
Isaiah 55:11 · Berean Standard Bible
so My word that proceeds from My mouth will not return to Me empty, but it will accomplish what I please, and it will prosper where I send it.
Context
9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,
otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri
si esi nʼeluigwe ada nʼụwa
na-alaghachighị nʼeluigwe
ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,
mee ka ihe ubi pupụta, too eto,
meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.
Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.
Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,
baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. 12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ,
a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo.
Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile
na osisi niile nke ubi,
ga-eti mkpu ọṅụ,
kụọkwa aka nʼobi ụtọ. 13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya;
ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya.
Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu,
nke ga-abụkwa ihe ịrịbama
ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.