Aịzaya 55:9
Isaiah 55:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
Isaiah 55:9 in English
Isaiah 55:9 · Berean Standard Bible
“For as the heavens are higher than the earth, so My ways are higher than your ways and My thoughts than your thoughts.
Context
7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,
ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.
Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,
ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,
ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,
otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri
si esi nʼeluigwe ada nʼụwa
na-alaghachighị nʼeluigwe
ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,
mee ka ihe ubi pupụta, too eto,
meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.
Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.
Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,
baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.