Aịzaya 55:7
Isaiah 55:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
Isaiah 55:7 in English
Isaiah 55:7 · Berean Standard Bible
Let the wicked man forsake his own way and the unrighteous man his own thoughts; let him return to the LORD, that He may have compassion, and to our God, for He will freely pardon.
Context
5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,
mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,
nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,
ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.
Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,
ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,
ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,
otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.