Aịzaya 55:5
Isaiah 55:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
Isaiah 55:5 in English
Isaiah 55:5 · Berean Standard Bible
Surely you will summon a nation you do not know, and nations who do not know you will run to you. For the LORD your God, the Holy One of Israel, has bestowed glory on you.”
Context
3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!
Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.
Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,
bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,
ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,
mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,
nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,
ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.
Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,
ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.