Aịzaya 55:3
Isaiah 55:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
Isaiah 55:3 in English
Isaiah 55:3 · Berean Standard Bible
Incline your ear and come to Me; listen, so that your soul may live. I will make with you an everlasting covenant— My loving devotion promised to David.*
Context
1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,
bịanụ na mmiri,
unu ndị na-enweghị ego
bịanụ zụọ, riekwa.
Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi
na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?
Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?
Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri
mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!
Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.
Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,
bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,
ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,
mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,
nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.