Aịzaya 55:2
Isaiah 55:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
Isaiah 55:2 in English
Isaiah 55:2 · Berean Standard Bible
Why spend money on that which is not bread, and your labor on that which does not satisfy? Listen carefully to Me, and eat what is good, and your soul will delight in the richest of foods.
Context
1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,
bịanụ na mmiri,
unu ndị na-enweghị ego
bịanụ zụọ, riekwa.
Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi
na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?
Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?
Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri
mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!
Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.
Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,
bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,
ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.