Aịzaya 55:12
Isaiah 55:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.
Isaiah 55:12 in English
Isaiah 55:12 · Berean Standard Bible
You will indeed go out with joy and be led forth in peace; the mountains and hills will burst into song before you, and all the trees of the field will clap their hands.
Context
10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri
si esi nʼeluigwe ada nʼụwa
na-alaghachighị nʼeluigwe
ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,
mee ka ihe ubi pupụta, too eto,
meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.
Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.
Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,
baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. 12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ,
a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo.
Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile
na osisi niile nke ubi,
ga-eti mkpu ọṅụ,
kụọkwa aka nʼobi ụtọ. 13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya;
ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya.
Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu,
nke ga-abụkwa ihe ịrịbama
ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.