Native Bible

Isaiah 54:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị

Isaiah 54:7 in English

Isaiah 54:7 · Berean Standard Bible

“For a brief moment I forsook you, but with great compassion I will bring you back.

Context

5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.