Aịzaya 54:7
Isaiah 54:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
Isaiah 54:7 in English
Isaiah 54:7 · Berean Standard Bible
“For a brief moment I forsook you, but with great compassion I will bring you back.
Context
5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị,
Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị
dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya
bụ nwunye alụtara na nwantakịrị,
naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.
Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m
zonarị gị ihu m,
ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,
bibie ndụ ndị dị nʼime ya,
ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.
Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.