Aịzaya 54:9
Isaiah 54:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
Isaiah 54:9 in English
Isaiah 54:9 · Berean Standard Bible
“For to Me this is like the days of Noah,* when I swore that the waters of Noah would never again cover the earth. So I have sworn that I will not be angry with you or rebuke you.
Context
7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.
Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m
zonarị gị ihu m,
ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,
bibie ndụ ndị dị nʼime ya,
ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.
Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,
wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,
ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,
agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”
ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru. 11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,
lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,
jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.