Aịzaya 54:8
Isaiah 54:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.
Isaiah 54:8 in English
Isaiah 54:8 · Berean Standard Bible
In a surge of anger I hid My face from you for a moment, but with everlasting kindness I will have compassion on you,” says the LORD your Redeemer.
Context
6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị
dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya
bụ nwunye alụtara na nwantakịrị,
naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.
Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m
zonarị gị ihu m,
ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,
bibie ndụ ndị dị nʼime ya,
ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.
Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,
wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,
ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,
agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”
ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.