Aịzaya 54:13
Isaiah 54:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
Isaiah 54:13 in English
Isaiah 54:13 · Berean Standard Bible
Then all your sons will be taught by the LORD,* and great will be their prosperity.
Context
11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,
lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,
jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile. 12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,
jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.
Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị. 13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.
Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,
nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.
Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,
nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ. 15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m;
onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.