Aịzaya 54:12
Isaiah 54:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
Isaiah 54:12 in English
Isaiah 54:12 · Berean Standard Bible
I will make your pinnacles of rubies, your gates of sparkling jewels, and all your walls of precious stones.
Context
10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,
wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,
ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,
agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”
ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru. 11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,
lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,
jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile. 12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,
jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.
Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị. 13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.
Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,
nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.
Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,
nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.