Aịzaya 54:15
Isaiah 54:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.
Isaiah 54:15 in English
Isaiah 54:15 · Berean Standard Bible
If anyone attacks you, it is not from Me; whoever assails you will fall before you.
Context
13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.
Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,
nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.
Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,
nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ. 15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m;
onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri. 16“Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ
nke na-eji icheku afụ ọkụ
o ji akpụ ihe agha nke mbibi.
Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha. 17Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.
Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.
Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị.
Mkpepụta* ha na-esite na m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
54:17 Mmeri ha maọbụ, ezi omume
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.