Aịzaya 51:4
Isaiah 51:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
Isaiah 51:4 in English
Isaiah 51:4 · Berean Standard Bible
Pay attention to Me, My people, and listen to Me, My nation; for a law will go out from Me, and My justice will become a light to the nations; I will bring it about quickly.
Context
2Legidenụ Ebraham bụ nna unu
na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu.
Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya,
ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. 3Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi,
werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ,
ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden,
ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị.
Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya,
inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. 4Ndị m, geenụ m ntị;
ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem,
nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ;
ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè. 5Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ,
nzọpụta m na-adịkwa nso.
Aga m achịkwa mba niile.
Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m;
ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha. 6Welienụ anya unu lee anya nʼelu,
leekwanụ anya nʼụwa,
nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ;
ụwa ga-aka nka dịka akwa,
ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji.
Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.