Aịzaya 51:2
Isaiah 51:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
Isaiah 51:2 in English
Isaiah 51:2 · Berean Standard Bible
Look to Abraham your father, and to Sarah who gave you birth. When I called him, he was but one; then I blessed him and multiplied him.
Context
1Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume,
ndị na-achọ Onyenwe anyị!
Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya.
E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya! 2Legidenụ Ebraham bụ nna unu
na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu.
Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya,
ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. 3Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi,
werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ,
ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden,
ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị.
Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya,
inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. 4Ndị m, geenụ m ntị;
ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem,
nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ;
ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.