Aịzaya 51:1
Isaiah 51:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
Isaiah 51:1 in English
Isaiah 51:1 · Berean Standard Bible
“Listen to Me, you who pursue righteousness, you who seek the LORD: Look to the rock from which you were cut, and to the quarry from which you were hewn.
Context
1Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume,
ndị na-achọ Onyenwe anyị!
Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya.
E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya! 2Legidenụ Ebraham bụ nna unu
na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu.
Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya,
ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba. 3Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi,
werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ,
ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden,
ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị.
Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya,
inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.