Aịzaya 51:6
Isaiah 51:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
Isaiah 51:6 in English
Isaiah 51:6 · Berean Standard Bible
Lift up your eyes to the heavens, and look at the earth below; for the heavens will vanish like smoke, the earth will wear out like a garment, and its people will die like gnats. But My salvation will last forever, and My righteousness will never fail.
Context
4Ndị m, geenụ m ntị;
ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem,
nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ;
ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè. 5Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ,
nzọpụta m na-adịkwa nso.
Aga m achịkwa mba niile.
Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m;
ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha. 6Welienụ anya unu lee anya nʼelu,
leekwanụ anya nʼụwa,
nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ;
ụwa ga-aka nka dịka akwa,
ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji.
Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ. 7Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma,
unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu.
Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu,
unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu. 8Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa.
Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ.
Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.