Aịzaya 50:8
Isaiah 50:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya.
Isaiah 50:8 in English
Isaiah 50:8 · Berean Standard Bible
The One who vindicates Me is near. Who will dare to contend with Me? Let us confront each other! Who has a case against Me? Let him approach Me!
Context
6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;
agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.
Ezopụghị m ihu m
nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,
ihere agaghị eme m.
Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,
a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.
Onye ga-apụta ibo m ebubo?
Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!
Onye nwere ebubo megide m?
Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.
Onye pụrụ ịma m ikpe?
Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,
nla ga-erichapụkwa ha. 10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,
na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya?
Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị,
nke na-enweghị ìhè ọbụla,
tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị
daberekwa na Chineke ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.