Aịzaya 50:9
Isaiah 50:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.
Isaiah 50:9 in English
Isaiah 50:9 · Berean Standard Bible
Surely the Lord GOD helps Me. Who is there to condemn Me? See, they will all wear out like a garment; the moths will devour them.
Context
7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,
ihere agaghị eme m.
Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,
a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.
Onye ga-apụta ibo m ebubo?
Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!
Onye nwere ebubo megide m?
Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.
Onye pụrụ ịma m ikpe?
Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,
nla ga-erichapụkwa ha. 10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,
na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya?
Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị,
nke na-enweghị ìhè ọbụla,
tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị
daberekwa na Chineke ha. 11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ,
ndị meere onwe ha ọwaọkụ,
nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị,
gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu.
Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị
bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.