Aịzaya 50:7
Isaiah 50:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.
Isaiah 50:7 in English
Isaiah 50:7 · Berean Standard Bible
Because the Lord GOD helps Me, I have not been disgraced; therefore I have set My face like flint, and I know that I will not be put to shame.
Context
5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,
ma enupughị m isi,
a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;
agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.
Ezopụghị m ihu m
nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,
ihere agaghị eme m.
Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,
a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.
Onye ga-apụta ibo m ebubo?
Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!
Onye nwere ebubo megide m?
Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.
Onye pụrụ ịma m ikpe?
Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,
nla ga-erichapụkwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.