Aịzaya 50:6
Isaiah 50:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.
Isaiah 50:6 in English
Isaiah 50:6 · Berean Standard Bible
I offered My back to those who struck Me, and My cheeks to those who tore out My beard. I did not hide My face from scorn and spittle.
Context
4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya
ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,
meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,
ma enupughị m isi,
a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;
agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.
Ezopụghị m ihu m
nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,
ihere agaghị eme m.
Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,
a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.
Onye ga-apụta ibo m ebubo?
Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!
Onye nwere ebubo megide m?
Ya bịa ka anyị kwuo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.