Aịzaya 50:4
Isaiah 50:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
Isaiah 50:4 in English
Isaiah 50:4 · Berean Standard Bible
The Lord GOD has given Me the tongue of discipleship, to sustain the weary with a word. He awakens Me morning by morning; He awakens My ear to listen as a disciple.
Context
2Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara?
Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku?
Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu?
Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta?
Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ.
Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara,
ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ
nʼihi enweghị mmiri. 3Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe,
ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.” 4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya
ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,
meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,
ma enupughị m isi,
a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;
agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.
Ezopụghị m ihu m
nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.