Aịzaya 50:3
Isaiah 50:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe, ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”
Isaiah 50:3 in English
Isaiah 50:3 · Berean Standard Bible
I clothe the heavens in black and make sackcloth their covering.”
Context
1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị
bụ nke m ji chụpụ ya?
Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ
ka m resiri unu?
Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu;
nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu. 2Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara?
Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku?
Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu?
Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta?
Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ.
Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara,
ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ
nʼihi enweghị mmiri. 3Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe,
ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.” 4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya
ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,
meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,
ma enupughị m isi,
a tụgharịkwaghị m azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.