Aịzaya 5:3
Isaiah 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
Isaiah 5:3 in English
Isaiah 5:3 · Berean Standard Bible
“And now, O dwellers of Jerusalem and men of Judah, I exhort you to judge between Me and My vineyard.
Context
1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,
abụ banyere ubi vaịnị ya.
Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya
nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala. 2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.
O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,
sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.
Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.
Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m. 4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya
karịa ihe m mere?
Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ
nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ? 5Ugbu a, lee,
ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a.
Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya,
hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri.
Aga m etida mgbidi ya
hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.