Aịzaya 5:4
Isaiah 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
Isaiah 5:4 in English
Isaiah 5:4 · Berean Standard Bible
What more could I have done for My vineyard than I already did for it? Why, when I expected sweet grapes, did it bring forth sour fruit?
Context
2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.
O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,
sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.
Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.
Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m. 4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya
karịa ihe m mere?
Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ
nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ? 5Ugbu a, lee,
ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a.
Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya,
hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri.
Aga m etida mgbidi ya
hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ. 6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.
Agakwaghị m egwuru ya ala,
aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya.
Aga m enyekwa igwe ojii iwu
ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.