Aịzaya 5:1
Isaiah 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
Isaiah 5:1 in English
Isaiah 5:1 · Berean Standard Bible
I will sing for my beloved a song of his vineyard: My beloved had a vineyard on a very fertile hill.
Context
1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,
abụ banyere ubi vaịnị ya.
Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya
nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala. 2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.
O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,
sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.
Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.
Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.