Aịzaya 46:8
Isaiah 46:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya, ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
Isaiah 46:8 in English
Isaiah 46:8 · Berean Standard Bible
Remember this and be brave; take it to heart, you transgressors!
Context
6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya,
na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ,
were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi,
emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe. 7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,
buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.
Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.
Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,
ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile. 8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,
ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi. 9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga,
nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa.
Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m. 10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite,
ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu.
Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide.
Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.