Aịzaya 46:6
Isaiah 46:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.
Isaiah 46:6 in English
Isaiah 46:6 · Berean Standard Bible
They pour out their bags of gold and weigh out silver on scales; they hire a goldsmith to fashion it into a god, so they can bow down and worship.
Context
4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu. 5“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha?
Onye ka unu ga-eji tụnyere m? 6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya,
na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ,
were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi,
emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe. 7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,
buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.
Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.
Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,
ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile. 8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,
ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.