Native Bible

Isaiah 46:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.

Isaiah 46:4 in English

Isaiah 46:4 · Berean Standard Bible

Even to your old age, I will be the same, and I will bear you up when you turn gray. I have made you, and I will carry you; I will sustain you and deliver you.

Context

2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha. 3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb, unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel, unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu. 4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu. 5“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha? Onye ka unu ga-eji tụnyere m? 6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.