Aịzaya 46:2
Isaiah 46:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.
Isaiah 46:2 in English
Isaiah 46:2 · Berean Standard Bible
The gods cower; they crouch together, unable to relieve the burden; but they themselves go into captivity.
Context
1Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu.
Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu.
Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ,
ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba! 2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu;
ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha,
ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha. 3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,
unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,
unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu
na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu. 4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.