Aịzaya 46:1
Isaiah 46:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
Isaiah 46:1 in English
Isaiah 46:1 · Berean Standard Bible
Bel crouches; Nebo cowers. Their idols weigh down beasts and cattle. The images you carry are burdensome, a load to the weary animal.
Context
1Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu.
Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu.
Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ,
ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba! 2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu;
ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha,
ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha. 3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,
unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,
unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu
na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.