Aịzaya 46:9
Isaiah 46:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
Isaiah 46:9 in English
Isaiah 46:9 · Berean Standard Bible
Remember what happened long ago, for I am God, and there is no other; I am God, and there is none like Me.
Context
7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,
buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.
Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.
Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,
ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile. 8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,
ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi. 9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga,
nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa.
Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m. 10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite,
ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu.
Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide.
Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’ 11Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe,
e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke* ahụ ga-abịa mee nzube m.
Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo;
ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.